Psalms 20

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid.

Ekpere maka enyemaka

1Ka Onyenwe anyị zaa gị nʼụbọchị nsogbu gị;
ka aha Chineke nke Jekọb chebe gị.
2Ya sitekwa nʼebe nsọ ya zitere gị inyeaka,
ma site na Zayọn kwagide gị.
3Ya chetakwa aja niile ị chụrụ,
ma nabata aja nsure ọkụ niile ị chụrụ nye ya. Sela
4Ya mezukwara gị ihe niile nke obi gị na-achọ,
mekwaa ka atụmatụ gị niile gaa nke ọma.
5Anyị ga-eti mkpu ọṅụ maka mmeri i meriri,
buliekwa ọkọlọtọ anyị elu nʼaha Chineke anyị.

Ka Onyenwe anyị mezuo arịrịọ gị niile.

6Ugbu a, amaara m
na Onyenwe anyị na-azọpụta onye ya o tere mmanụ;
ọ na-esite nʼebe nsọ ya nʼeluigwe jiri aka nri ya,
zọpụta ma zakwaa ya.
7Ụfọdụ na-atụkwasị obi ha na ịnyịnya, ndị ọzọ nʼụgbọ agha;
ma anyị na-atụkwasị aha Onyenwe anyị, Chineke anyị, obi.
8Ha na-egbu ikpere nʼala ma daa,
ma anyị ga-ebili, kwụrụ chịm.
9O Onyenwe anyị, zọpụta eze!
Zakwaa anyị mgbe anyị kpọkuru gị!
Copyright information for IboBIU